1 Corinthians 14:7 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ọ bụkwa otu a ka ọ dị nꞌetiti ihe nile na-enweghị ndụ, ma ha bụ ihe na-eme ụzụ dị ka opi, ma ọ bụ ụbọ akwara. O nweghị onye ga-aghọta ihe onye na-afụ opi na-egbu ma ọ bụ ihe onye na-akpọ ụbọ akwara na-akpọ ma ọ bụrụ na ọ maliteghị ya nke ọma.
Igbo 2006
Ọbuná ihe nējighi ndu, mb͕e olu-ha nāda udà, ma ọ bu ọ̀jà ma-ọbu ubọ-akwara, ọ buru na ọ dighi ihe di iche n'olu-ha, àgēsi aṅa mara ihe anāfù ma-ọbu nke anākpọ?
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ bụkwa otu a ka ọ dị nʼetiti ihe niile na-enweghị ndụ, nke na-ada ụda, dịka ọja, maọbụ ụbọ akwara. Ọ bụrụ na ha enyeghị ụda dị iche site na nke ọzọ, olee ụzọ mmadụ ga-eji mara maọbụ ọja ka a na-afụ, maọbụ ụbọ akwara ka a na-akpọ.