1 Corinthians 15:10 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ma site nꞌamara Chineke, abụ m ihe m bụ taa. Chineke meere m ebere dị ukwuu, wụkwasị m amara ya. Ana m egosikwa na obi ebere Chineke nꞌebe m nọ abụghị ihe efu, nꞌihi na arụọla m ọrụ karịa ndị ozi nile. Ma nꞌezie ọ bụghị m na-arụ ọrụ a, kama ọ bụ Chineke nꞌonwe ya na-arụ ọrụ ya nꞌime m, ịgọzi m.
Igbo 2006
Ma site n'amara Chineke abum ihe m'bu: ahu-kwa-ra na amara-Ya nke enyerem abughi ihe-efu; kama adọb͕ubigaram onwem ókè n'ọlu kari ha nile: ma ọ bughi mu onwem, kama amara Chineke nke sorom.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma site nʼamara nke Chineke, abụ m ihe m bụ. Ọ pụtakwara na amara ya nʼebe m nọ abụghị ihe efu. Kama arụsịrị m ọrụ ike karịchasịa ndị ozi niile. Ma nʼezie, ọ bụghị m na-arụ ọrụ a, kama ọ bụ Chineke nʼonwe ya na-arụ ọrụ ya nʼime m.