1 Corinthians 15:20 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ma eziokwu ahụ pụtara ìhè bụ na e mere ka Kraịst si nꞌọnwụ bilie nꞌezie, ọ bụkwa onye mbụ nꞌetiti ndị nile nwụrụ nꞌime ya, ndị na-aghaghị isi nꞌọnwụ bilie nꞌotu ụbọchị.
Igbo 2006
Ma otú ọ di, emewo ka Kraist si na ndi nwuru anwu bilie, nkpuru mbu nke ndi daworo n'ura ọnwu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma e mere ka Kraịst si nʼọnwụ bilie nʼezie, onye mbụ nʼetiti ndị niile nwụrụ anwụ.