1 Corinthians 15:27 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Nꞌihi na akwụkwọ nsọ ekwuola sị, “Chineke edoola ihe nile nꞌokpuru ọchịchị Kraịst.” Ma “Ihe nile” a apụtaghị na Chineke so, nꞌihi na ọ bụ ya na-edo “Ihe nile” nꞌokpuru Kraịst.
Igbo 2006
N'ihi na, Ihe nile ka O doro n'okpuru ukwu-Ya abua. Ma mb͕e ọ bula O gēkwuwori, si, Edowo ihe nile n'okpuru Ya, ọ putara ìhè na Ọ nọghi ya, bú Onye doro ihe nile n'okpuru Ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼihi na “O doola ihe niile nʼokpuru ụkwụ ya.” Ma mgbe ọbụla asịrị, “e doola ihe niile” nʼokpuru ụkwụ ya, o doro anya na Chineke agụnyeghị onwe ya, nʼihi na ọ bụ ya tinyere ihe niile nʼokpuru Kraịst.