1 Corinthians 15:29 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ọ bụrụ na mbilite nꞌọnwụ adịghị, ọ̀ bara uru ime ndị mmadụ baptizim nꞌaha ndị nwụrụ anwụ? Gịnị mere e ji mee ha baptizim ma ọ bụrụ na ha enweghị olileanya na ndị nwụrụ anwụ ga-emesị bilie dị ndụ ọzọ?
Igbo 2006
N'ihi na asi na ọ dighi otú a, gini ka ha gēme, bú ndi anēme baptism n'ọnọdu ndi nwuru anwu? Ọ buru na emeghi ka ndi nwuru anwu si n'ọnwu bilie ma-ọli, ọ̀ bu kwa gini mere anēme ha baptism n'ọnọdu ha?
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma ọ bụghị otu a, gịnị mere ụfọdụ ji eme ndị otu ha baptizim nʼọnọdụ ndị nwụrụ anwụ? Ọ bụrụ na e meghị ka ndị nwụrụ anwụ si nʼọnwụ bilie ma ọlị, nʼihi gịnị ka a na-eme mmadụ ndị a baptizim nʼọnọdụ ha?