1 Corinthians 15:32 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ọ bụrụ na ndụ anyị na-agwụ nꞌụwa a, dị ka ndị mmadụ na-ekwu, gịnị bụkwanụ uru m nwere nꞌihi ọgụ m na-alụso anụ ọhia, bụ ndị ikom Efesọs? Ọ bụrụ na a gaghị eme ka ndị nwụrụ anwụ bilie, ịdọgbu onwe anyị nꞌọrụ adịghị mkpa, kama ka anyị nọọ nꞌoriri na ọṅụṅụ mgbe nile, nꞌihi na ọ bụrụ na anyị nwụọ echi, ebe a ka ihe nile gwụsịrị.
Igbo 2006
Ọ buru na abumri onye nālu ọ̀gù megide anu-ọhia n'Efesọs dika madu si eme, ùrù gini baram? Ọ buru na emeghi ka ndi nwuru anwu si n'ọnwu bilie, ka ayi rie ṅu kwa, n'ihi na echi ka ayi gānwu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ bụrụ na ndụ anyị na-agwụ nʼụwa a, dịka ndị mmadụ na-ekwu, gịnị bụkwanụ uru m nwere nʼihi ọgụ m na-alụso anụ ọhịa, bụ ndị ikom Efesọs? Ọ bụrụ na a gaghị eme ka ndị nwụrụ anwụ bilie, “Ka anyị rienụ, ṅụọkwanụ, nʼihi na echi anyị ga-anwụ.”