1 Corinthians 15:40 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ndị nọ nꞌeluigwe nwekwara anụ ahụ nke ha, nke dịkwa iche site na nke anyị ndị bi nꞌụwa. Ịma mma ha na ebube nke ndị nọ nꞌeluigwe dịkwa iche na nke ndị bi nꞌụwa.
Igbo 2006
Aru nke elu-igwe na aru nke uwa di kwa: ma ebube nke aru nke elu-igwe bu otù, ebube nke aru nke uwa di kwa iche.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ahụ nke eluigwe na ahụ nke ụwa dịkwa. Ma ịma mma na ebube nke ahụ nke eluigwe bụ otu, ịma mma na ebube nke ahụ nke ụwa dịkwa iche.