1 Corinthians 15:48 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Mmadụ nile nwere anụ ahụ dị ka Adam, nke e si nꞌịta kpụọ. Ma ndị nile bụ nke Kraịst ga-enwe ụdị anụ ahụ ahụ Kraịst nwere, anụ ahụ nke si nꞌeluigwe.
Igbo 2006
Aha madu onye ahu ejiri ájá kpu di, madu di otú a ka ndi eji ájá kpu di kwa: ọzọ, aha madu Onye elu-igwe ahu di, madu di otú a ka ndi elu-igwe di kwa.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Dị ka mmadụ nke mbụ ahụ e jiri aja kpụọ dị, otu a ka ndị niile si nʼaja pụta dịkwa. Ma dị ka mmadụ nke eluigwe ahụ dị, otu a ka ndị niile bụ ụmụ eluigwe dịkwa.