1 Corinthians 15:58 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ya mere, ụmụnna m, ebe unu maara na unu ga-emeri nꞌikpeazụ, guzosienụ ike nꞌokwukwe unu. Bụrụnụ ndị guzo chịm, ndị nọgidesịrị ike na-arụ ọrụ Onyenwe anyị, nꞌihi na unu maara na ọ dịghị ọrụ ọ bụla unu rụụrụ Onyenwe anyị bụ ihe efu, ebe ha ga-adị mgbe anyị bilitere nꞌọnwụ.
Igbo 2006
Ya mere, umu-nnam m'huru n'anya, guzosienu ike, burunu ndi anāpughi iropu eropu, ndi nālubiga ọlu Onye-nwe-ayi ókè mb͕e nile, ebe unu matara na ndọb͕u unu nādọb͕u onwe-unu n'ọlu abughi ihe-efu nime Onye-nwe-ayi.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ya mere, ụmụnna m ndị m hụrụ nʼanya, kwụsienụ ike, bụrụnụ akwaa akwụrụ. Nọgidenụ nʼọrụ Onyenwe anyị mgbe niile, ebe unu maara na ọrụ unu na-arụ nʼime Onyenwe anyị abụghị ihe efu.