1 Corinthians 15:6 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Emesịakwa, o gosiri ihe karịrị narị mmadụ ise onwe ya nꞌotu oge. Ọtụtụ nꞌime ndị ahụ ka nọ ndụ taa, ọ bụ ezie na ụfọdụ nꞌime ha anwụọla.
Igbo 2006
emesia O mere ka ndi kari nnù madu na ọgu ise n'etiti umu-nna-ayi hu Ya anya n'otù mb͕e, ndi ka n'ọnu-ọgugu n'etiti ndi ahu nānọgide rue ub͕u a, ma ufọdu adawo n'ura ọnwu;
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Emesịakwa, o gosiri ihe karịrị narị mmadụ ise nʼime ụmụnna onwe ya, nʼotu mgbe, ọtụtụ nʼime ndị ahụ ka nọ ndụ taa, ọ bụ ezie na ụfọdụ nʼime ha adaala nʼụra ọnwụ.