1 Corinthians 16:11 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ka onye ọ bụla ghara ileda ya anya nꞌihi na ọ bụ okorọbịa. Kama nyerenụ ya aka ka o nwee ike jiri ọṅụ lọghachikwute m. Mụ na ndị nile na-akwado ịlọghachikwute unu na Kọrint na-ele anya ịhụ unu.
Igbo 2006
ya mere, ka onye ọ bula ghara ikpọ ya ihe-efu. Kama dupunu ya n'ije-ya n'udo, ka o we biakutem: n'ihi na anamele anya na ọ gēso umu-nna-ayi bia.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ka onye ọbụla ghara ileda ya anya. Kama, dupunụ ya nʼije ya nʼudo ka o nwe ike lọghachikwute m. Mụ na ụmụnna ndị ọzọ na-ele anya nlọta ya.