1 Corinthians 16:3 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Mgbe m bịara, aga m enye ndị unu họpụtara onyinye a ka ha bulaara ya ndị Kraịst nọ na Jerusalem. Aga m enyekwa ha akwụkwọ ozi nke ga-akọwa ndị ha bụ, nye nzukọ Kraịst dị na Jerusalem.
Igbo 2006
Ma mb͕e ọ bula m'biaruru, ndi ọ bula unu gānwaputa, m'gēwere akwukwọ-ozi ziga ndi ahu ibūru ihe-amara-unu je Jerusalem:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe m bịara, aga m edenye ndị ahụ kwesiri ntụkwasị obi, bụ ndị unu họpụtara akwụkwọ nkọwa, ziga ha ibugara ndị nọ na Jerusalem onyinye obiọma unu.