1 Corinthians 2:10 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ọ bụ nanị anyị ka Chineke kpugheere ihe omimi a; o sitere na Mmụọ Nsọ ya mee ka anyị mata ya. Mmụọ Nsọ Chineke bụ onye na-enyochapụta ihe omimi na ihe nzuzo nile dị Chineke nꞌobi, ọ bụ ya na-egosikwa anyị ihe ha bụ.
Igbo 2006
Ma ọ bu ayi onwe-ayi ka Chineke kpughere ha site n'aka Mọ Nsọ: n'ihi na Mọ Nsọ nēnyocha ihe nile, ọbuná ihe nile di omimi nke Chineke.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma Chineke e kpugherela anyị ihe omimi ndị a site na Mmụọ Nsọ ya. Mmụọ Nsọ bụ onye na-enyochapụta ihe omimi na ihe nzuzo niile dị Chineke nʼobi.