1 Corinthians 2:11 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ọ dịghị onye ọ bụla pụrụ ịma ihe onye ọzọ na-eche nꞌobi ya. Ọ bụ nanị mmụọ nọ nꞌime onye ahụ bụ onye maara ihe nile banyere ya. Ọ dịkwaghị onye pụrụ ịmata ihe Chineke na-eche nꞌobi ya, ma ọ bụghị nanị Mmụọ Chineke nꞌonwe ya.
Igbo 2006
N'ihi na ònye n'etiti madu matara ihe nile nke madu, ma-ọbughi mọ nke madu ahu, nke di nime ya? ọbuná otú a ọ dighi onye mara ihe nke Chineke, ma-ọbughi Mọ nke Chineke.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ dịghị onye ọbụla pụrụ ịma ihe onye ọzọ na-eche nʼobi ya. Ọ bụ naanị mmụọ nọ nʼime onye ahụ bụ onye mara ihe niile banyere ya. Ọ dịkwaghị onye pụrụ ịmata ihe Chineke na-eche nʼobi ya, ma ọ bụghị naanị Mmụọ nke Chineke.