1 Corinthians 2:13 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Mgbe anyị gwara unu okwu banyere onyinye ndị a, anyị ji okwu ahụ Mmụọ Nsọ tinyere anyị nꞌọnụ kwuo ya, ọ bụghị okwu nke anyị ji aka anyị họrọ site na mmụta anyị. Ya mere, ọ bụ okwu nke Mmụọ Nsọ tinyere anyị nꞌọnụ ka anyị ji kọwaa ihe gbasara Mmụọ Nsọ.
Igbo 2006
Ọ bu kwa ihe ndia ka ayi nēkwu, ọ bughi n'okwu nke amam-ihe madu nēzí, kama n'okwu nke Mọ Nsọ nēzí; ayi nēwere kwa ihe nke Mọ Nsọ tule ihe nke Mọ Nsọ.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nke a bụ ihe anyị na-ekwu, ọ bụghị nʼokwu a kuziiri anyị site nʼamamihe mmadụ, kama site nʼokwu nke Mmụọ kuziri anyị; anyị ji okwu nke Mmụọ na-akọwa eziokwu nke mmụọ.