1 Corinthians 2:4 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ihe nile m ziri unu na ihe nile m kwusara, bụ ihe dịrị onye ọ bụla nꞌime unu mfe ịghọta. Ejighị m oke okwu na-ezipụta mmụta m, ma ọ bụ amamihe m gwa unu okwu, kama ọ bụ Mmụọ Nsọ Chineke gbara okwu ndị ahụ nile m gwara unu ume, mee ka ọ pụta ìhè nye ndị nụrụ okwu ahụ, na ihe m kwuru bụ okwu Chineke.
Igbo 2006
Okwum na ihe m'kwusara abughi kwa n'okwu amam-ihe, ime ka madu kweye, kama ha bu na ngosi nke Mọ Nsọ na nke ike:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Okwu m na ihe m kwusara abịakwaghị dịka okwu ire ụtọ na nke oke mmụta, ime ka ndị mmadụ kwere, kama ha bịara nʼụzọ igosi ọrụ nke Mmụọ Nsọ na ike ya.