1 Corinthians 2:6 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Otu ọ dị, mgbe ọ bụla m nọ na-ekwuru ndị okwukwe ha siri ike nꞌime Kraịst okwu, ana m eji okwu amamihe gwa ha okwu. Ma okwu amamihe nke m na-ekwu ihe banyere ya abụghị okwu amamihe nke ụwa a, ọ bụghị okwu amamihe nke na-atọ ndị ọkachamara ụwa a ụtọ, nꞌihi na ndị dị otu a aghaghị ịla nꞌiyi.
Igbo 2006
Otú ọ di, amam-ihe bu ihe ayi nēkwu n'etiti ndi tozuru okè: ma ọ bu amam-ihe nke nābughi nke oge a, ọ bughi kwa nke ndi-isi oge a, ndi anēme ka ha ghara idi irè:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma otu ọ dị, anyị na-ekwu okwu amamihe nʼebe ndị tozuru oke nọ. Ma ọ bụghị amamihe nke oge a, maọbụ nke ndị na-achị ụwa taa, bụ ndị na-aghaghị ịla nʼiyi.