1 Corinthians 3:10 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Eji m onyinye amara Chineke nyere m tọọ ntọ ala ọrụ a, dị ka ezi onye ọka na-ese ihe osise ụlọ. Ugbu a onye ọzọ amalitela iwukwasị ụlọ nꞌelu ntọ ala ahụ. Ma ka onye ọ bụla kpachapụ anya otu o si ewu.
Igbo 2006
Dika amara Chineke nke enyerem si di, dika onye-isi-ọ̀kà nke mara ihe, atọrọm ntọ-ala; onye ọzọ nēwu kwa ulo n'elu ya. Ma ka onye ọ bula lezi anya otú ọ nēwu ulo n'elu ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Eji m onyinye amara Chineke nyere m tọọ ntọala ọrụ a, dịka ezi onye ọka nʼiwu ụlọ, onye ọzọ amalitela iwukwasị ụlọ nʼelu ntọala ahụ. Ma ka onye ọbụla kpachapụ anya otu o si ewu.