1 Corinthians 3:12 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ma e nwere ọtụtụ ihe dị iche iche mmadụ pụrụ iji wuo ụlọ nꞌelu ntọ ala ahụ. Ụfọdụ ga-eji ọlaedo na ọlaọcha, ma ọ bụkwanụ nkume dị oke ọnụ ahịa wuo nke ha ṅdị ọzọ ga-eji osisi okporo ọka ma ọ bụ ahịhịa wuo nke ha.
Igbo 2006
Ma ọ buru na onye ọ bula ewukwasi ọla-edo, ọla-ọcha, nkume di oké ọnu, osisi, ahihia, okporo-ọka, n'elu ntọ-ala ahu;
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma ọ bụrụ na mmadụ ọbụla na-eji ọlaedo maọbụ ọlaọcha, ma ọ bụkwanụ nkume dị oke ọnụahịa, osisi maọbụ okporo ọka, ma ọ bụkwanụ ahịhịa na-ewukwasị nʼelu ntọala ahụ,