1 Corinthians 3:13 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ma otu ụbọchị na-abịa mgbe ọrụ nke onye ọ bụla rụrụ ga-apụta ìhè, ụbọchị ahụ a ga-anwapụta ụdị ihe anyị ji wuo ụlọ nꞌelu ntọ ala ahụ. A ga-esite nꞌọkụ na-enwụsi ike wefee ọrụ nile onye ọ bụla rụrụ lee ọrụ ahụ ule, ịchọpụta ma ọrụ ahụ ọ ga-adịgide adịgide.
Igbo 2006
agēme ka ọlu nke madu nile n'otù n'otù puta ìhè: n'ihi na ubọchi ahu gēgosi ya, n'ihi na agaje ikpughe ya n'ọku; ọku onwe-ya gānwa kwa ọlu madu nile n'otù n'otù, aha ọlu ọ bu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
ọrụ onye ọbụla ga-egosipụta ihe ọ bụ, nʼihi na Ụbọchị ahụ ga-eme ka ọ pụta ìhè. A ga-eji ọkụ kpughee ya nʼihi na ọ bụ ọkụ ka a ga-eji nwapụta ụdị ọrụ ọ bụ mmadụ ọbụla rụrụ.