1 Corinthians 4:10 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Okwukwe anyị kwere na Kraịst emeela ka anyị ghọọ ndị nzuzu nꞌihu unu, ma unu onwe unu bụkwa ndị Kraịst maara ihe! Lee ka anyị si bụrụ ndị na-adịghị ike, mgbe unu na-awụgharị dị ka agụ. Lee ka anyị si bụrụ ndị a jụrụ ajụ na ndị a na-agụ dị ka ndị na-abaghị uru, ma unu bụ ndị a na-asọpụrụ!
Igbo 2006
Ayi onwe-ayi bu ndi-nzuzu n'ihi Kraist, ma unu onwe-unu bu ndi nwere uche nime Kraist; ayi onwe-ayi adighi ike, ma unu onwe-unu di ike; anēnye unu onwe-unu otuto, ma anēme ayi onwe-ayi ihe-ihere.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Anyị aghọọla ndị nzuzu nʼihi Kraịst, ma unu onwe unu bụ ndị maara ihe nʼime Kraịst. Anyị bụ ndị na-adịghị ike ma unu dị ike. Anyị bụ ndị a jụrụ ajụ na ndị a na-eleda anya, ma unu bụ ndị a na-asọpụrụ.