1 Corinthians 4:17 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ọ bụ nke a mere m ji ezitere unu Timoti ka ọ bịa nyere unu aka ime nke a. Nꞌihi na Timoti bụ ezi nwa m, onye kwesịrị ntụkwasị obi. Ọ ga-eme ka unu mata ihe nile m na-ezi nꞌụlọ nzukọ Kraịst nile m na-aga.
Igbo 2006
N'ihi nka ka m'zitere unu Timọti, onye bu nwam nime Onye-nwe-ayi, buru kwa onye m'huru n'anya, onye kwesiri ntukwasi-obi, ọ gēchetara unu uzọm nile nke di nime Kraist, dika m'nēzí n'ebe nile na nzukọ Kraist nile ọ bula.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼihi nke a, ana m ezitere unu Timoti, bụ ezi nwa m onye m hụrụ nʼanya, nke kwesiri ntụkwasị obi nʼime Onyenwe anyị. Ọ ga-echetara unu otu m si e bi ndụ nʼime Onyenwe anyị Kraịst Jisọs, dịka m na-akụzi ya nʼebe niile na nzukọ niile.