1 Corinthians 4:3 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ọ bụghị m ka ọ dịrị ikwu na m bụ ezi odibo, ma ọ bụ ajọ odibo. Anaghị m echegbu onwe m banyere ihe unu na-eche gbasara m, ajụkwaghị m ajụjụ banyere ihe ndị ọzọ na-eche. Nꞌezie, anaghị m atụkwasịkwa uche nꞌihe akọnuche m na-ekwu banyere ọrụ m na-arụ.
Igbo 2006
Ma ọ burum ihe dikarisiri ntà ka unu, ma-ọbu ubọchi ikpé nke madu, kpem ikpé: é-è, ekpeghi m ọbuná onwem ikpé.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Anaghị m echegbu onwe m banyere ihe unu na-eche gbasara m maọbụ ihe a na-ekpe nʼụlọikpe nke mmadụ. Nʼezie, anaghị m ekpekwa onwe m ikpe.