1 Corinthians 4:5 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Nꞌihi ya jienụ onwe unu aka ikpe onye ọ bụla ikpe tutuu oge ikpe eruo. Cherenụ ruo mgbe Onyenwe anyị nꞌonwe ya ga-abịa igbubi ikpe nile. Ọ ga-eme ka ihe nile ụmụ mmadụ na-eme ugbu a na nzuzo pụta ìhè. Ọ ga-agbakwa ọchịchọ nzuzo dị ndị mmadụ nꞌobi nꞌanwụ. Mgbe ahụ onye ọ bụla ga-anatakwa nꞌotu nꞌotu, otuto ruuru ya site nꞌaka Chineke.
Igbo 2006
Ya mere, unu ekpela ihe ọ bula ikpé mb͕e oge ahu akērughi, rue mb͕e ọ bula Onye-nwe-ayi gābia, Onye gēweputa kwa ihe nile ezoro ezo nke ọchichiri n'ìhè, me kwa ka ìzù nile nke obi nile puta ìhè; mb͕e ahu ka madu nile n'otù n'otù gēnwe kwa otuto-ha site n'aka Chineke.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ya mere, unu ekpela ikpe tupu oge ya eruo, cherenụ ruo mgbe Onyenwe anyị nʼonwe ya ga-abịa. Ọ ga-eme ka ihe niile zoro ezo nʼọchịchịrị pụta ìhè. Ọ ga-agbakwa ọchịchọ nzuzo niile nke dị nʼobi nʼanwụ. Mgbe ahụ, onye ọbụla nʼotu nʼotu ga-anatakwa otuto ruuru ya site nʼaka Chineke.