1 Corinthians 4:7 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Nꞌihi na gịnị mere i ji akpa nganga? Olee ihe i nwere nke ọ na-abụghị Chineke nyere gị ya? Ugbu a, ọ bụrụ na ihe nile i nwere si nꞌaka Chineke rute gị, gịnị na-ebu gị isi? Gịnị mere i ji eme dị ka ọ dị ihe ị pụrụ ime nꞌonwe gị?
Igbo 2006
N'ihi na Ònye nākpa ókè n'etiti gi na madu-ibe-gi? ọ̀ bu gini kwa ka i nwere nke i nānataghi? ma ọ buru na i natara ya, gini mere i nānya isi, dika agāsi na i nataghi ya?
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Onye gwara gị na ị pụrụ iche nʼetiti mmadụ ndị ọzọ? Ọ dị ihe ọbụla i nwere nke abụghị ihe ị natara anata? Ọ bụ gịnị ka i nwere nke ị na-anataghị anata? Ma ọ bụrụ na i natara ya, gịnị mere i ji anya isi dịka a ga-asị na ị nataghị ya anata?