1 Corinthians 4:8 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ndụ unu na-ebi na-egosi na echiche unu bụ na unu enwezuola ihe nile dị unu mkpa. Ee, unu na-ebi ndụ dị ka ndị afọ juru nꞌihe nke Mmụọ. Unu na-ebi ndụ dị ka ndị eze, ndị nọkwasịrịla nꞌocheeze ha, ma anyị onwe anyị nọ nꞌezi. Nꞌezie, ọ gaara atọ ma a sị na unu anọrọla nꞌocheeze unu, nꞌihi na mgbe oge ịnọ nꞌocheeze ruru, ghọtanụ na anyị onwe anyị ga-anọkwa nꞌebe ahụ, iso unu ịchị achị.
Igbo 2006
Ọbuná ub͕u a unu erijuwo afọ, ọbuná ub͕u a unu ghọrọ ọgaranya, unu buru eze mb͕e ayi onwe-ayi nānọghi ya: e, ọ gādim nọ̄ mma, ma asi na unu buru eze n'ezie, ka ayi onwe-ayi we so kwa unu buru eze.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma ugbu a, ihe niile zuru unu oke. Ugbu a, unu abụrụkwala ndị ọgaranya. Unu abụrụla eze ma anyị esoghị unu. Nʼezie, ọ gaara atọ m ụtọ ma a sị na unu anọrọla nʼocheeze unu, ka anyị nwe ike soro unu bụrụ eze.