1 Corinthians 4:9 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Mgbe ụfọdụ ọ na-adị m nnọọ ka Chineke na-eme ka anyị bụ ndị ozi bụrụ ndị dịkarịsịrị ala, ndị a na-echeta nanị mgbe ihe nile na-agwụsị agwụsị. Anyị dị ka ndị a mara ikpe ọnwụ, ndị a na-akpọpụta nꞌihu ọha mmadụ mee anyị ihe nlere anya nye ụmụ mmadụ na ndị mmụọ ozi.
Igbo 2006
N'ihi na anamechè na Chineke were ayi, bú ndi-ozi, gosi, dika ndi-ikpe-azu, dika ndi amara ikpé ọnwu: n'ihi na emere ayi ihe-nkiri nye uwa na ndi-mọ-ozi na madu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ na-adị m nnọọ ka Chineke o weere anyị bụ ndị ozi mee anyị ndị dịkarịsịrị ala, ndị a na-echeta naanị mgbe ihe niile na-agwụsị agwụsị, dịka ndị a mara ikpe ọnwụ. Nʼihi na-akpọpụtara anyị nʼihu ọha mmadụ mee anyị ihe nlere anya nye ụmụ mmadụ na ndị mmụọ ozi.