1 Corinthians 5:1 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ọtụtụ mmadụ agwala m ụdị ihe ọjọọ na-eme nꞌụlọ chọọchị unu. Ihe jọgburu onwe ya, nke ndị na-ekweghị ekwe na-apụghị ime, ka unu na-eme. A gwara m na ọ dị otu nwoke nọ nꞌime ụlọ chọọchị unu onye ya na nwụnye nna ya na-akwa iko.
Igbo 2006
Anānu nọ̄ na ikwa-iko di n'etiti unu, aha ikwa-iko nke nādighi kwa ọbuná n'etiti ndi mba ọzọ, nke mere na otú onye n'etiti unu nwere nwunye nna-ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ bụ akụkọ doro anya na-enwe ịkwa iko nʼetiti unu, ụdị nke ndị na-ekweghị ekwe na-apụghị ime, ka unu na-eme. Otu onye nʼime ụlọ unu kpọọrọ nwunye nna ya, ha abụọ e biri.