1 Corinthians 5:10 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Mgbe m gwara unu okwu ahụ, ọ bụghị ihe gbasara mmekọ unu na ndị na-ekweghị ekwe na-akwa iko, na ndị na-enwe anya ukwu, na ndị na-ezu ohi, na ndị na-efe arụsị ka m na-ekwu. Nꞌihi na o nweghị ụzọ unu na ndị dị otu a pụrụ isi hapụ imekọrịta nꞌụwa, karịa ma unu si nꞌụwa pụọ kpamkpam.
Igbo 2006
ọ bughi ndi nke uwa nka ndi nākwa iko ma-ọli, ma-ọbu ndi-anya-uku-ya na ndi nāpunara madu ihe, ma-ọbu ndi nēkpere arusi: ebe ọ gādi unu nkpà isi n'uwa pua ma asi na unu eme otú a:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ bụghị ihe gbasara ndị nke ụwa ndị na-akwa iko, maọbụ ndị anya ukwu, na ndị na-apụnara mmadụ ihe, maọbụ ndị na-ekpere arụsị. Ọ bụrụ otu a, ọ pụtara na unu ga-esi nʼụwa pụọ.