1 Corinthians 5:11 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Kama ndị m bu nꞌuche dee ihe ahụ bụ ndị ahụ kpọrọ onwe ha ndị Kraịst, ma ha nọgidere na-akwa iko, ma ọ bụ na-enwe anya ukwu, ma ọ bụ na-efe arụsị. Ee, ndị ahụ sị na ha bụ ndị Kraịst ma nọgidekwa na-ekwutọ ibe ha, na-aṅụbiga mmanya oke, ma na-ezukwa ohi. Unu na ndị dị otu a enwela mmekọ ọ bụla. Unu esola ha rikọọ ihe.
Igbo 2006
ma otú ọ di, edegaram unu ka unu na onye ọ bula nke anākpọ ya aha na ọ bu nwa-nna ghara imekọ ihe, ma ọ buru na onye ahu bu onye nākwa iko, ma-ọbu onye-anya-uku, ma-ọbu onye nēkpere arusi, ma-ọbu onye-nkwutọ, ma-ọbu onye nāṅubiga manya ókè, ma-ọbu onye nāpunara madu ihe; ka unu na onye di otú a ghara ọbuná irikọ ihe.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma ugbu a, a na m edere unu ka unu na onye ọbụla nke na-akpọ onwe ya nwanna nwoke maọbụ nwanna nwanyị ghara imekọ ihe, ma ọ bụrụ na ọ na-ebi ndụ ịkwa iko, maọbụ nwee anya ukwu, maọbụ na-ekpere arụsị, onye na-ekwutọ ibe ya, onye na-aṅụbiga mmanya oke, maọbụ onye na-apụnara mmadụ ihe. Unu na ndị dị otu a erikọla nri.