1 Corinthians 5:6 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Olee uru ọ bara na unu nọ na-anya isi mgbe ihe ọjọọ dị otu a na-eme nꞌetiti unu? Ọ̀ bụ na unu amaghị na ọ bụrụ na unu agbaa nkịtị, hapụ nwoke a, ka ọ na-eme mmehie ya gaa nꞌihu, na ihe ọjọọ a ga-emekụta ndị ọzọ nọ nꞌụlọ chọọchị unu?
Igbo 2006
Ihe-inya-isi-unu adighi nma. Ùnu amataghi na ihe-iko-achicha di ntà nēko ob͕e utu ọka agwọrọ agwọ dum?
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ịnya isi unu ezighị ezi. Ọ bụ unu amaghị na nwantakịrị yiist a gwakọrọ nʼụtụ ọka na-eme ka o koo?