1 Corinthians 5:8 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ugbu a ka anyị dabere na Kraịst, si otu a na-eto eto nꞌime ndụ anyị dị ka ndị nke ya. Ka anyị wezuga ndụ ochie ahụ jupụtara nꞌekworo na ọrụ ọjọọ nile. Ka anyị jiri eziokwu na ịdị ọcha zụjuo onwe anyị afọ dị ka nri.
Igbo 2006
ya mere, ka ayi nēme ememe ahu, ọ bughi n'ihe-iko-achicha ochie, ọ bughi kwa n'ihe-iko-achicha nke bu obi ọjọ na ajọ ọlu, kama n'achicha ekoghi-eko nke bu idi-ọcha na ezi-okwu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼihi ya ka anyị mee mmemme a na-ejighị ihe na-eko achịcha nke bụ ihe ọjọọ na obi ọjọọ, kama ka anyị jiri achịcha na-ekoghị eko nke bụ obi ọcha na eziokwu.