1 Corinthians 6:1 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Gịnị mere o ji bụrụ na unu na nwanne unu nwoke nꞌime Kraịst nwee esemokwu, unu eburu okwu ahụ gaa nꞌụlọ ikpe ka ndị na-ekweghị ekwe kpeere unu ikpe? Gịnị gbochiri unu iji okwu ahụ gaa nꞌọgbakọ Kraịst, ka ndị kwere ekwe nọkọọ doziere unu okwu ahụ?
Igbo 2006
Ọ̀ di onye ọ bula n'etiti unu, ma asi na o nwere okwu megide ibe-ya, nwere anya-ike ije ikpé n'iru ndi ajọ omume, ma ọ bughi n'iru ndi nsọ?
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe onye ọbụla nʼetiti unu nwere esemokwu megide ibe ya, unu ọ pụrụ i buru okwu ahụ gaa nʼụlọikpe ka ndị ajọ omume kpeere unu ikpe, karịa ịga ya nʼihu ndị nsọ?