1 Corinthians 6:3 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ọ̀ bụ na unu amatakwaghị na ọ bụ anyị ga-ekpe ndị mmụọ ozi nọ nꞌeluigwe ikpe? Gịnị ga-emekwa ka anyị ghara idozi nsogbu nile dapụtara nꞌetiti anyị nꞌụwa a?
Igbo 2006
Ùnu amataghi na ayi gēkpe ndi-mọ-ozi ikpé? àyi gēsi aṅa ghara inwe ike ikpe ihe nke ndu a?
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ bụ na unu amataghị na ọ bụ anyị ga-ekpe ndị mmụọ ozi ikpe? Gịnị ga-emekwa ka anyị ghara idozi okwu ụka dịkarịsịrị nta nke ndụ a?