1 Corinthians 6:7 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ebe unu na-enwe esemokwu nke unu ji aga nꞌụlọ ikpe, ọ pụtara ìhè na unu na-ala azụ nꞌokwukwe unu. Gịnị gbochiri gị idi na ịnagide mmejọ e mejọrọ gị na nghọgbu a ghọgburu gị?
Igbo 2006
Ezie ọ bu nọ̄ ila-ala n'ebe unu nọ ọbuná ub͕u a, na unu nwere okwu ikpé n'etiti onwe-unu. Kari nke ahu, n'ìhi gini unu adighi-ekwe ka emegide unu ajọ omume? kari nke ahu, n'ìhi gini unu adighi-ekwe ka emeb͕ue unu?
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ebe unu na-enwe esemokwu nke ikpe ikpe nʼetiti unu, ọ pụtara na unu bụ ndị emeriri kpamkpam. Nʼihi gịnị ka unu na-adịghị ekwe ka emejọ unu? Nʼihi gịnị ka unu na-adịghị ekwe ka a ghọgbuo unu?