1 Corinthians 7:17 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Bikonụ mgbe unu na-enwe mkpebi unu nꞌihe ndị a, ka onye ọ bụla na-ebi ndụ ya dị ka Chineke chọrọ ka o bie ya. Onye na-alụ di ma ọ bụ nwụnye, ya mee ya dị ka otu Chineke si duzie. Onye nke na-adịghị alụkwa, ya meekwa dị ka Chineke siri duzie ya. Nke a bụ iwu m na-enye nꞌụlọ chọọchị nile m gara.
Igbo 2006
Ọ bu nání, dika Onye-nwe-ayi kèworo nye onye ọ bula, dika Chineke kpọworo onye ọ bula, ya jegharia otú a. Otú a ka m'nāka kwa àkà nime nzukọ Kraist nile.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ka onye ọbụla bie ndụ ya dịka amara Onyenwe anyị nyere ya si dị, nakwa nʼọnọdụ nke Chineke kpọrọ ya. Nke a bụ iwu m na-enye nʼụlọ chọọchị niile.