1 Corinthians 7:18 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Dị ka ihe ịma atụ, ọ bụrụ na ọ dị onye e biri ugwu tupuu ya anabata Onyenwe anyị, ka nke a hapụ iwute ya. Ka onye a na-ebighị ugwu hapụ inye onwe ya nsogbu, ịchọ ụzọ a ga-esi bie ya ugwu.
Igbo 2006
Àkpọrọ onye ọ bula mb͕e ebìsiri ya úgwù? ya ghara ighọ onye anēbìghi úgwù. Àkpọworo onye ọ bula n'ebìghi-úgwù? ya ghara ikwe ka ebì ya úgwù.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Akpọrọ onye ọbụla mgbe e biri ya ugwu? Ya achọla iwepụ akara obibi ugwu ya. Ka onye a na-ebighị ugwu tupu ọkpụkpọ ya hapụ inye onwe ya nsogbu ịchọ ụzọ a ga-esi bie ya ugwu.