1 Corinthians 7:25 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ajụjụ ọzọ unu jụrụ bụ banyere ụmụ agbọghọ na-alụbeghị di. Unu na-ajụ ma o ziri ezi nꞌezie ka ha lụọ di. Enweghị m iwu ọ bụla site nꞌaka Chineke banyere ajụjụ a, ma o nyere m amamihe nke a pụrụ ịtụkwasị obi. Nꞌihi nke a, leenụ ihe m chere banyere ajụjụ a.
Igbo 2006
Ma enweghi m ihe Onye-nwe-ayi nyere n'iwu bayere umu-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke: ma enyem ìzùm, dika onye Onye-nwe-ayi meworo ebere ka m'buru onye kwesiri ntukwasi-obi.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ihe banyere ụmụ agbọghọ na-amaghị nwoke. Enweghị m iwu ọbụla site nʼaka Onyenwe anyị banyere ajụjụ a, ma aga m ekwu uche nke aka m dịka onye sitere nʼebere nke Onyenwe anyị kwesiri ntụkwasị obi.