1 Corinthians 7:34 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Nꞌụzọ dị otu a, ọ na-enwekwa obi abụọ nꞌihe ọ bụla ọ chọrọ ime. Otu a ka ọ dịkwa nwagbọghọ lụrụ di. Echiche ya nile bụ ime ka ihe dị nꞌezinụlọ ya dị mma, na ime ihe ga-atọ di ya ụtọ. Ma ọchịchọ nwagbọghọ na-enweghị di bụ ime ihe ga-atọ Chineke ụtọ.
Igbo 2006
Akpawo kwa ókè n'etiti nwunye na nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke. Nwanyi nke nēnweghi di nēcheb͕u onwe-ya n'ihe nke Onye-nwe-ayi, ka o we di nsọ n'aru-ya na mọ-ya kwa: ma nwanyi nke nwere di nēcheb͕u onwe-ya n'ihe nke uwa, otú ọ gēme ihe gātọ di-ya utọ.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ na-enwekwa obi abụọ nʼihe ọbụla ọ chọrọ ime. Otu a ka ọ dịkwa nye nwaagbọghọ na-alụbeghị di maọbụ onye nke na-amabeghị nwoke, nchegbu ya bụ banyere ihe nke Onyenwe anyị. Ọchịchọ ya bụ ka ọ dị nsọ nʼanụ ahụ ya na nʼime mmụọ ya. Ma nwanyị nwere di na-echegbu onwe ya banyere ihe nke ụwa a, otu ọ ga-esi mee ihe ga-atọ di ya ụtọ.