1 Corinthians 7:35 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ihe m na-eme abụghị ịgbalị igbochi unu ịlụ di ma ọ bụ nwụnye, kama ọ bụ inyere unu aka. Ya mere, achọrọ m ka unu mee ihe ahụ unu maara ga-enyere unu aka iji otu obi rụọra Chineke ọrụ.
Igbo 2006
Ma nka ka m'nēkwu ka ọ bara unu onwe-unu urù; ọ bughi ka m'fekwasi ihe-ntuhi n'aru-unu, kama ka eme ihe kwesiri, ya na ka unu we nọdu n'iru Onye-nwe-ayi ghara inwe uche-nb͕asasi.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ana m ekwu ihe ndị a maka ọ dị mma nke unu onwe unu, ọ bụghị ịgbalị igbochi unu, kama ọ bụ ka unu nwee ike bie ndụ unu nʼụzọ kwesiri ekwesi, werekwa ịhụnanya zuruoke rụọra Onyenwe anyị ọrụ.