1 Corinthians 7:39 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Njikọta e jikọtara nwụnye na di ya na-adị ire nanị mgbe di nwanyị dị ndụ. Ọ bụrụ na di ya anwụọ o nwere ike ịlụ di ọzọ ma ọ bụrụ na ọ lụọ nanị onye nke Kraịst.
Igbo 2006
Ekewo nwunye n'aru di-ya ka oge di-ya nọ na ndu ra; ma asi na di-ya adawo n'ura ọnwu, o nwere onwe-ya ilu di ọ nāchọ; ma ọ bu nání nime Onye-nwe-ayi.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Njikọta e jikọtara nwunye na di ya na-adị ire naanị mgbe di nwanyị dị ndụ. Ọ bụrụ na di ya anwụọ o nwere ike ịlụ di ọzọ, ma ọ lụọ ya nʼime Onyenwe anyị.