1 Corinthians 8:1 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ajụjụ ọzọ unu jụrụ bụ ihe banyere iri anụ e ji chụọra arụsị aja. Nꞌụdị ajụjụ dị otu a onye ọ bụla na-eche na ọsịsa nke ya dị mma. Ma ọ bụ ezie na anyị na-anya isi nꞌihi na anyị na-akpọ onwe anyị ndị maara ihe, ma ihe dịkarịsịrị mkpa iji iwuli ụlọ nzukọ Kraịst elu bụ nanị ịhụnanya.
Igbo 2006
Ma okwu bayere ihe achuru n'àjà nye arusi: Ayi matara na ayi nile nwere ọmuma-ihe. Ọmuma-ihe nāfuli elu, ma ihu-n'anya nēwuli elu dika ulo.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ugbu a, nʼokwu banyere nri a chụrụ nʼaja nye arụsị, anyị ma na onye ọbụla nwere amamihe. Amamihe na-afụli mmadụ elu mee ka ọ nyaa isi. Ma ịhụnanya na-ewuli elu.