1 Corinthians 8:13 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Nꞌihi nke a, ọ bụrụ na iri anụ e ji chụọra arụsị aja ga-eme ka nwanne m mee mmehie, agaghị m eso rie ya mgbe ọ bụla, ka m ghara ime ka nwanne m mee mmehie.
Igbo 2006
N'ihi nka, ma ọ buru na ihe-oriri eme ka nwa-nnam ma n'ọnyà, m'gaghi-eri anu ma-ọli rue mb͕e ebighi-ebi, ka m'ghara ime ka nwa-nnam ma n'ọnyà.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼihi nke a, ọ bụrụ na ihe oriri ga-eme ka nwanna m mee mmehie, agaghị m eri anụ ọzọ, ka m ghara ime ka nwanna m maa nʼọnya.