1 Corinthians 8:4 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ugbu a ka anyị tulee ajụjụ unu. Ò kwesịrị ka anyị rie anụ e ji chụọra arụsị aja? Anyị nile maara na o nweghị arụsị dị, na ihe ndị mmadụ na-akpọ arụsị abụghị ihe ọ bụla. Anyị matakwara na ọ bụ nanị otu Chineke dị.
Igbo 2006
Ya mere okwu bayere iri ihe achuru n'àjà nye arusi, ayi matara na ọ dighi arusi ọ bula bu ihe n'uwa, ayi mata-kwa-ra na ọ dighi Chineke ọzọ ma-ọbughi otù.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ya mere, ihe banyere nri a chụrụ nʼaja nye arụsị, anyị maara na “Arụsị abụghị ihe ọbụla nʼụwa”, matakwa na “Chi ọzọ adịghị ma ọ bụghị otu Chineke.”