1 Corinthians 8:6 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ma nꞌebe anyị nọ anyị maara na ọ bụ nanị otu Chineke dị, onye bụ Nna, onye okike, onye kere ihe nile, meekwa ka anyị bụrụ ndị nke ya. Ọ bụkwa nanị otu Onyenwe anyị ka anyị nwere, onye bụ Jisọs Kraịst. Onye e sitere nꞌaka ya kee ihe nile, onye na-enyekwa anyị ndụ.
Igbo 2006
ma n'ebe ayi nọ otù Chineke di, bú Nna, Onye ihe nile sitere na Ya, Onye ayi onwe-ayi di-kwa-ra Ya; otù Onye-nwe-ayi di kwa, bú Jisus Kraist, Onye ihe nile sitere n'aka-Ya, ayi onwe-ayi site-kwa-ra n'aka-Ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma nʼebe anyị nọ, anyị maara na ọ bụ naanị otu Chineke dị, onye bụ Nna, onye kere ihe niile, na onye anyị na-adị ndụ nʼihi ya. Ọ bụkwa naanị otu Onyenwe anyị ka anyị nwere, onye bụ Jisọs Kraịst, onye e sitere nʼaka ya kee ihe niile, onye na-enyekwa anyị ndụ.