1 Corinthians 8:7 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ma otu ọ dị, ọ bụghị ndị Kraịst nile maara eziokwu a. Nꞌime ndụ ha nile, ha na-ele arụsị anya dị ka chi dị ndụ. Ha na-echekwa na ihe ọ bụla e ji chụọra arụsị aja, na ọ bụ chi dị ndụ ka e ji ya chụọra aja. Nꞌihi nke a, mgbe ọ bụla ha riri ihe e ji chụọ aja nye arụsị, ọ na-ewute mmụọ ha nke ukwuu nꞌihi na ha na-eche na ihe ha riri emerụọla ha.
Igbo 2006
Otú ọ di ọ bughi nime madu nile ka ọmuma-ihe ahu di: kama ufọdu, ebe arusi bu ihe anēme n'ala-ha rue ub͕u a, ha nēri ihe ahu dika ihe achuru n'àjà nye arusi; anēmeru kwa akọ-na-uche-ha, ebe ọ nādighi ike.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma otu ọ dị, ọ bụghị onye ọbụla nwere ihe ọmụma a. Ụfọdụ nʼime ndụ ha niile, ha na-ele arụsị anya dịka chi dị ndụ. Ha na-echekwa na ihe ọbụla e ji chụọrọ arụsị aja, na ọ bụ chi dị ndụ ka e ji ya chụọrọ aja. Nʼihi nke a, mgbe ọbụla ha riri ihe e ji chụọ aja nye arụsị, ọ na-ewute mmụọ ha nke ukwuu nʼihi na akọnuche ha esighị ike, ọ na-emerụkwa ya.