1 Corinthians 9:10 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
É, è! O bukwa anyị nꞌobi kwuo ya. Nꞌezie, e dere ihe ndị a nꞌihi anyị, nꞌihi na onye kụrụ mkpụrụ nꞌubi na onye gara wee ihe dị nꞌubi ahụ, kwesịrị iketa oke site na mkpụrụ e si nꞌubi ahụ weta.
Igbo 2006
ma-ọbu Ò nēkwu ya n'ihi ayi onwe-ayi? E, n'ihi ayi ka edere ya n'akwukwọ nsọ: n'ihi na onye nālu ọlu ubi kwesiri ilu ọlu ubi n'olile-anya, onye nāzọcha ọka kwesiri kwa izọcha n'olile-anya na ọ gēketa.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
E, nʼihi anyị ka eji dee ya nʼakwụkwọ. Nʼezie, e dere ihe ndị a nʼihi anyị, nʼihi na onye rụrụ ọrụ nʼubi na onye na-azọcha mkpụrụ dị nʼubi ahụ, na-eme nke a nʼolileanya na o kwesiri iketa oke site na mkpụrụ e si nʼubi ahụ weta.