1 Corinthians 9:16 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ọ bụghị na ọ dị ihe ọzọ pụrụ iche ikwusa ozi ọma na-ewetara m. Enweghị m ike ịkwụsị ikwusa ozi ọma. Nꞌihi na ọ bụrụ na m akwụsị ikwusa ozi ọma, agaghị enwe udo na ọṅụ ọ bụla. Onye a bụrụ ọnụ ka m ga-abụ ma ọ bụrụ na m akwụsị ikwusa ozi ọma Onyenwe anyị.
Igbo 2006
N'ihi na asi na anam-ezisa ozi ọma, enweghi m ihe inya isi; n'ihi na nkpà nākpam; n'ihi na ahuhu dirim, asi na ezisaghi m ozi ọma.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Anaghị anya isi nʼihi na ana m ezisa oziọma, maka na nke ahụ bụ ọrụ e nyere m nʼiwu ka m rụọ. Ahụhụ dịịrị m ma ọ bụrụ na m ezisaghị oziọma.