1 Corinthians 9:18 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ebe m na-arụ ya dị ka ọrụ m na-aghaghị ịrụ, gịnị bụ ụgwọ ọrụ m? Ụgwọ ọrụ m bụ ọṅụ m na-enwe site nꞌizisa ozi ọma a, na-anaghị onye ọ bụla ụgwọ ọrụ ọ bụla, ma ọ bụ ihe ruru m.
Igbo 2006
Gini kwa bu ugwọ-ọlum? Mb͕e m'nēzisa ozi ọma, ka m'we me ka ozi ọma ahu buru ihe ego nādighi nime ya, ka m'ghara ijizu ike nkem inara ihe n'ozi ọma ahu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Gịnị bụ ụgwọ ọrụ m? Ụgwọ ọrụ m bụ ọṅụ m na-enwe site nʼizisa oziọma a, na-anaghị onye ọbụla ụgwọ ọrụ ọbụla, maọbụ ihe ruru m dịka onye na-ezisa oziọma ahụ.