1 Corinthians 9:19 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Site nꞌụzọ dị otu a, abụghị m ohu onye ọ bụla nꞌihi na o nweghị onye m nọ nꞌokpuru ya nke na-akwụ m ụgwọ ọrụ, kama abụ m onyenwe onwe ya. Ma emeela m onwe m ohu nye mmadụ nile ka m nwee ike site nꞌụzọ dị otu a rite ọtụtụ mkpụrụ obi nꞌuru nye Kraịst.
Igbo 2006
N'ihi na ọ bu ezie na enwerem onwem n'ebe madu nile nọ, ma emerem onwem ka m'buru orù madu nile, ka m'we rita ọtutu madu n'urù kari.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ bụ ezie na-abụghị m ohu onye ọbụla, ma emeela m onwe m ohu nye mmadụ niile ka m nwee ike site nʼụzọ dị otu a rite ọtụtụ mkpụrụobi nʼuru nye Kraịst.